ỌDỊDỊỤDA OLU OLOKORO
Abstract
Asụsụ Igbo nwegasịrị olu ndị dị n’ime ya nke olu Olokoro bụ otu n’ime ha. Nchọcha a lebara anya n’ọdịdịụda olu Olokoro. Amụmamụ ọdịdịụda na-elenye anya na mkpụrụụda na ka e si eji ya arụ ọrụ n’asụsụ ma ọ bụ n’olundị. Ọ bụ nke a kpalitere mmasị nchọcha a igosipụta ọdịdịụda olu Olokoro site n’ịchọpụta mkpụrụụda na usoro mkpụrụụda ndị dị n’olu Olokoro. A chịkọtara njiatụle e jiri mee nchọcha a nke e nwetara site na nsere. Nchọcha a gbasokwara usoro nkọwasị na ntụcha njiatụle. Ndị nchọcha chọpụtara na e nwere mkpụrụụda iri isii na itoolu n’olu Olokoro. N’ime mkpụrụụda iri isii na itoolu a dị n’olu Olokoro, iri isii na otu bụ mgbochiume, ebe asatọ ndị ọzọ bụ ụdaume. Ha chọpụtakwara na mkpụrụụda iri na abụọ na-anọ n’ọnọdụ nnọnabarịị n’ụfọdụ mkpụrụokwu n’olu Olokoro ma gosipụtakwa na olulo, ọ kachasị na mkpụrụokwu nrụaka na-apụta ihe nke ọma n’olu Olokoro. Olu Olokoro dị ka olumba ndị ọzọ nwere nkọwapụta pụrụ iche nke wepugara ya iche site n’olu ndị ọzọ dị n’asụsụ Igbo. Ọ bụ olu Igbo kwesịrị nnyocha maka na usoro mkpụrụụda ya, usoro mmebe okwu ya, usorookwu ya na usoro echiche ya, bụ nke pụrụ iche.