ECHICHE MBỤRỤ ANỤMANỤ N’ASỤSỤ IGBO NA N’ASỤSỤ BEKEE

Authors

  • Patrick Ik. Umezi Author

Abstract

Nchọcha a bụ maka echiche mbụrụ anụmanụ n’asụsụ Igbo na n’asụsụ Bekee. Ihe kpalitere nwanchọcha ime nchọcha a bụ, n’agbanyeghi mkpa ọ dị ịmata myiri na ndịiche dị n’etiti mbụrụ anụmanụ n’asụsụ Igbo na asụsụ Bekee, o nwebeghi onye merela nchọcha iji chọpụta ha. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta ma detuo echiche dị na mbụrụ anụmanụ n’asụsụ Igbo na echiche o nwere n’asụsụ Bekee iji chọpụta myiri na ndịiche dị n’etiti mbụrụ anụmanụ n’asụsụ abụọ a. Atụtụ mgbakwasa ụkwụ nchọcha a bụ atụtụ njirime. Nchọcha a gosiri na ụfọdụ myiri dị n’etiti ha bụ na a bịa n’asụsụ Igbo nakwa asụsụ Bekee, ihe agwọ na-egosi bụ ekwesighi ntụkwasị obi, agụ bụ ịkpaike, ahụhụ bụ ipe mpe, agụ owuu bụ oke agụụ, ejula bụ ime nwayọọ. A chọpụtakwara na ndịiche dị n’etiti ha bụ: a bịa n’asụsụ Igbo, ihe atụrụ na-egosi bụ nzuzu, mana n’asụsụ Bekee, ọ bụ enweghi onwe. N’asụsụ Igbo, ehi bụ ibu ibu, mana n’asụsụ Bekee, ọ bụ nzuzu; n’asụsụ Igbo, ọkụkọ na-egosi ịgba mbọ mana a bịa n’asụsụ Bekee, ọ bụ ịtụ ụjọ ka ọ na-egosi. N’ikpeazụ, nwanchọcha mejupụtara ebumnobi ya site n’ime ka onye ọbụla mata na mbụrụ anaghị ezipụta echiche nkịtị. Ya bụ na mbụrụ anụmanụ nwere echiche dị iche iche site n’otu agbụrụ ruo n’ọzọ, sitekwa n’otu asụsụ ruo n’ọzọ.

Downloads

Published

2018-10-24