Ntulekọrịta Ngwaa Asụsụ Igbo na Ngwaa Asụsụ Latịn
Abstract
Nchọcha a bụ ntụlekọrịta ngwaa asụsụ Igbo na ngwaa asụsụ Latịn. Ụdị nchọcha a bụ nchọcha ntụlekọrịta asụsụ. Ihe ndị nchọcha bu n’obi bụ ịmata ebe ngwaa asụsụ Igbo na ngwaa asụsụ Latịn si yite onwe ha ma ọ bụ nwee ndịiche. Ihe kpalitere mụọ ndị nchọcha ime nchọcha n’isiokwu a bụ na imilikiti ụmụafọ Igbo na-amụ asụsụ Latịn ka asụsụ mba ofesi na-enwekarị ihe mkpọbi ụkwụ oge ha na-eme nke a, tinyere na o nwebeghị onye a tụrụ ọnụ kpọmkwem na o meela nchọcha n’isiokwu a. Atụtụ a gbasoro were mee nchọcha a bụ atụtụ ntụlekọrịta asụsụ si n’aka Lado (1957). Ka e mechara nchọcha a, a chọpụtara na ngwaa asụsụ Igbo na ngwaa asụsụ Latịn nwere ọtụtụ myiri na ndịiche. Myiri dị n’etiti ha bụ na: a na-esi na ha enweta okwu ọhụụ, ha na-anabata mgbakwụnye; ha na-enwe opeka mpe otu ụdaume; ha na-eso mkpọaha n’azụ n’ahịrịokwu; ha nwegbadoro isingwaa. Ndịiche dị n’etiti ha bụ na: ngwaa asụsụ Latịn na-ezipụta ọnụọgụ mana ngwaa asụsụ Igbo anaghị ezipụta ọnụọgụ; ngwaa asụsụ Latịn na-adị na ngwụcha ahịrịokwu mana ngwaa asụsụ Igbo na-adịkewe n’etiti isiahịrị na nnara; mgbochiume nwere ike ijedewe ngwaa asụsụ Latịn mana ọ bụ naanị ụdaume na-ejedewe ngwaa Igbo; n’ahịrịnjụ, mgbakwụnye ngwaa Igbo na-adị n’azụ isingwaa mana mgbakwunye ngwaa Latịn na-adị n’ihu isingwaa; ngwaa Latịn na-agbaso ndakọrịta katigori ụtọasụsụ mana nke a adịghị mkpa maka ngwaa Igbo. N’ikpeazụ, ndị nchọcha tụpụtara aro ka ndị isi ụlọakwụkwọ dị iche iche gbaa mbọ webata akwụkwọ Igbo na Latịn n’ọba akwụkwọ ha. Ọzọkwa, ndị gọọmenti ga-agba mbọ tinye asụsụ Latịn n’ihe ọmụmụ a na-eme n’ụlọakwụkwọ niile. Ihe ndị a ga-eme ka ọ dị mfe inweta ngwaọrụ maka ime nchọcha dị otu a n’ọdịnihu.