Nsogbu Olundi na-ebute n’Ọmụmụ Asụsụ Igbo Izugbe: Isi Ala Ngwa Dị ka Ebe Mgbakwasị Ukwu
Abstract
Obodo anyị bụ Naịjirịa bụ obodo e nwere agbụrụ dị iche iche, nke karịrị narị abụọ na ise n’ọnụ ọgụgụ (Emenanjo, 1978). N’ime agbụrụ ndị a, Igbo, Hausa na Yoruba kacha pụta ìhè. Gọọmentị ala anyị agbaala mbọ iwepụta atumatu, ebumnuche na iwu na-achị mmụta n’ala anyị. Atumatu ndị a ha wepụtara gụnyere mkpa ọ dị ịmụ asụsụ ala anyị, na mkpa ọ dị itinye asụsụ Igbo n’ihe ọmụmụ n’ụlọ akwụkwọ. Nke a ga-enyere aka inwe ezi nchekwa n’ebe omenala na ọdịnala dị. Ndị gọọmentị hụrụ asụsụ dị ka ihe ga-eweta njikọta nke mba. Asụsụ bụ ụzọ dị iche iche mmadụ na ibe ya si enwe mmekọrịta, ma ọ bụkwa ụda sitere n’olu mmadụ nwere nghọta mgbe e jikọtara okwu dị iche iche n’ụzọ kwesịrị ekwesị (Anozie, 1999). Asụsụ bụkwa usoro okwu ma ọ bụ nhazi ụda nke otu mba maara nke ọma ma jiri ya na-ekwurịta okwu n’etiti onwe ha. Mbah na Mbah (2001) kọwara asụsụ dị ka ụzọ e si e zipụta ebumnuche mmadụ, mmekọrịta mmadụ, ma ọ bụ ihe mmadụ chọrọ site n’ụda ma ọ bụkwa akara ederede.
Mgbe ọbụla anyị na-ekwu okwu asụsụ, ma ọ bụ nke ederede ma ọ bụ nke a na-asụ ọnụ, ọ dị mkpa ichebara echiche nke ọma, n’ihi na ọtụtụ ndị mmadụ, n’agbanyeghị na ha na-asụ asụsụ, na-ele asụsụ Igbo anya dịka ihe a na-eleghara anya. Ma mgbe a bịara n’iji asụsụ kụziere ihe, a na-ahụ ọtụtụ ihe isi ike na-egbochi mmepe ya. Nke a mere Agbedo (1991) ji sị na “asụsụ bụ tụrụ dị n’isi ọkpụkpụ na-ebe ndụ mmadụ dị.” Nke a pụtara na asụsụ metụtara ihe niile mmadụ na-eme na ndụ ya. Agbedo (1991) gara n’ihu kọwaa na ọdịnala ndị mmadụ ji ebi ndụ ga-enwe asụsụ; nke a pụtara na omenala enweghị ike ịrụ ọrụ ọ bụla ma ọ bụrụ na asụsụ akwadoghị ya. A na-ahụ asụsụ dị ka onyinye Chineke nyere mmadụ, nke mmadụ ọbụla e kere eke nwere ike iji kparịta ụka ma ọ bụ kọwapụta ihe dị mkpa. N’akwụkwọ Stonehill na ndị ọzọ (1979), a kọwara na Chineke jiri ọtụtụ asụsụ kee nsogbu n’etiti ndị Babylon n’oge ha na-arụ ụlọ elu ga-erute elu igwe. Nke a mere ka agbụrụ ahụ gbasasịa, wee bụrụ ihe kpatara ịdị iche iche nke asụsụ dị n’ụwa taa.