Igba Mmanwụ, Otu n’ime Omenala Igbo: Ugwu na Nsopụrụ, Ọdịda na Olileanya Ya
Abstract
Ndị Igbo bụ otu n’ime agbụrụ atọ kachasị ibu n’ala Naịjirịa. E nweela ọtụtụ akụkọ banyere etu ndị Igbo si malite, mana e nwebeghị nkwekọrịta doro anya gbasara akụkọ ndị a. Ka o sina dị, ihe ndị a chọpụtara na Igbo-Ukwu, bụ otu n’ime ebe ndị Igbo si nwee njirimara, na-egosi na ndị Igbo anọwo kemgbe ihe dị ka puku afọ ise gara aga. Ha bụ ndị maara onwe ha, ndị na-agba mbọ, ma bụrụkwa ndị gbasiri ike. A na-ahụ ha n’ụwa dị iche iche, ha na-asụkwa otu ụdị asụsụ, ebe ihe jikọrọ ha ọnụ bụ omenala ha. Anozie (2003:106) kọwara omenala dị ka ụzọ dị iche iche ndị mmadụ si ebi ndụ, emume ha, ihe ha na-eri, ụdị uwe ha na-eyi, na usoro ekele ha. Ọ sịrị na agbụrụ ọ bụla nwere omenala nke ya; ọ nweghị omenala na-eto n’onwe ya n’enweghị ndị mmadụ. Ihe gbasara obibi ndụ bụ otu n’ime ihe ndị na-egosipụta omenala, nke na-eme ka mmadụ dị iche na ihe ndị ọzọ Chukwu kere eke. Omenala Igbo bụ ihe ndị e ji mara ndị Igbo, dịka ilu nwaanyị, ile ọmụgwọ, echichi dị iche iche, igba mmanwụ, ekike, igba mgba, na ụdị nri ha, wdg. Omenala na-apụtakwa ìhè n’ihe ndị a dịka ọchịchị, okpukperechi, akparamàgwà na emume dị iche iche, nke igba mmanwụ bụ otu n’ime ha. Ekwealor (2010:29) kọwara omenala dị ka otu ndị si ebi ndụ ha; omenala bụ ihe e ji amata mmadụ ma ọ bụ obodo. Nke a mere o ji bụrụ ihe dị mkpa ka agbụrụ ọ bụla na-echekwa omenala ha. Ogbalu (1981), dị ka Ekwealor (2010:29) si kwuo, kọwara omenala dị ka ihe anyị na-eme, otu anyị si ebi ndụ, ihe anyị na-eri, ihe anyị na-eyi, na ụdị ejiji anyị; ya bụ, ihe niile e ji mara anyị dịka mba, gụnyere abụ anyị na-abụ, egwu anyị na-ete, na omume na agwa anyị.