Nzipụta ndị Igbo site n’Abụ Ọdịnala
Abstract
Ndị Igbo nwere ọrụ dị iche iche ha na-arụ, nke ha si na ya akpata ihe ha ji ebi ndụ. Ọrụ ugbo bụ otu n’ime ọrụ kachasị ha na-arụ. Ha na-akụkwa ọtụtụ mkpụrụ osisi, na-akpa anụmanụ, ma na-emepụtakwa ihe nka dị iche iche. Ndị Igbo nwekwara ụzọ dị iche iche ha si enwe ezumike. Ọ bụ n’oge ezumike ka a na-amụ egwu dị iche iche dịka egwu mmanwụ, egwu ụmụntakịrị, egwu ụmụnwaanyị na nke ụmụnwoke. A na-eji egwu ndị a eme ka obodo kpoo ọkụ, karịchaa n’oge emume na oriri. Ọzọkwa, egwu ndị a na-ezipụta ụzọ ndụ, nkwenye, na omenala ndị Igbo n’ụzọ pụrụ iche. Egwu ọdịnala Igbo bụ ihe dị oké mkpa, mana ọ na-alazị azụ ma na-anwụ n’oge ugbu a n’ihi nleghara anya ụfọdụ ndị Igbo na-eleghara abụ ọdịnala ha. Ebumnobi nchọpụta a bụ igosipụta abụ ọdịnala dịka enyo e ji ahụ ndụ n’ọdịdị dị iche iche n’ime ndụ ndị Igbo. A lebakwara anya n’ihe bụ abụ ọdịnala na ụdị abụ ọdịnala dị iche iche dịka abụ mmanwụ, abụ nwa, abụ agha, na abụ ntọala, wdg. A gbasoro usoro nchọpụta sayensị (survey research), site n’ajụjụ ọnụ e jụrụ ndị mmadụ iji nweta ngwaọrụ e ji mee nchọpụta a. A chọpụtakwara uru abụ ọdịnala bara, dịka inye aka n’igbazi ndụ ọha na eze. N’ịkwụsị, a tụrụ anya na ụmụ amaala Igbo niile ga-esite na mkpụrụ nchọpụta a were nye abụ ọdịnala Igbo ọnọdụ kwesịrị ekwesị na ndụ ha.