Ntụgharị Isi Nke Abụọ: Idụụazụ Chike and the River n’Igbo

Authors

  • Daniel Ilechukwu & Chioma Arazu Author

Abstract

Ntụgharị bụ isi n’otu asụsụ degharịrị ihe n’asụsụ ọzọ. E nwere usoro dị iche iche e si eme ntụgharị. Usoro ndị a na-enyere aka ime ka ntụgharị gaa nke ọma ma doo anya. Ha gụnyere Usoro Ntụgharị Teknụzụ (Technological Translation), Usoro Ntụgharị Mkpokọta (General Translation), na Usoro Ntụgharị Agụmagụ (Literary Translation). Ntụgharị metụtara ederede a bụ Ntụgharị Agụmagụ nke ndị Bekee kpọrọ Literary Translation. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị emeela ntụgharị n’akwụkwọ agụmagụ Idụụazụ site na Bekee banye n’Igbo, mana ọ dịbeghị onye tụgharịrị akwụkwọ agụmagụ Chike and the River n’Igbo n’ụzọ zuru ezu. Nke a kpatara eji họrọ ịtụgharị naanị isi nke abụọ nke akwụkwọ a n’Igbo iji hụ na e mere ezi ntụgharị. Iji mee ka ntụgharị a bụrụ nke ọma, a gbasoro usoro ntụgharị dị iche iche dịka Mbite (Loaning), Ntụgharịta (Calque), Mgbanwegharị (Transposition), na Nhara (Equivalence). A gbasoro ụzọ nchọpụta a kpọrọ “Dynamic Equivalence” nke Alexandra Tytler wubere n’afọ 1790 wee duzie nchọpụta a.

Downloads

Published

2016-09-23