ASỤSỤ IGBO NA MWULITE OBODO
Abstract
Ngwere hapụ ukwu osisi, ụmụaka akpara ya aka. Oke osisi daa ụmụ nnụnụ eju ọhịa, o doro ewu na ọkụkọ anya na mmiri bụ ndụ azụ, o nweghị mgbe a ga-ekwu maka mwulite obodo na ọganiihu ma hapụ asụsụ. Na obodo na-aga n’ihu mepee emepe, nwee udo na nchịkọta, na ịdịnotu bụ asụsụ. A na-asịna asụsụ bụ obodo nke pụtara na asụsụ bụ isi sekpu ntị n’obodo ma bụrụkwa e jewe aghaghị na agamniihu na mmepe obodo. Asụsụ bụ “ike”, ewepụ ya o nweghị onye ga-aghọta ibe ya, ọganiihu agaghị adị, ọ bụ onye sụọ nwanne ya aghọta ya bụ n’obodo na-aga n’ihu. Asụsụ dị mkpa maka mwube, mwulite obodo, onye mụtara asụsụ nne ya nke ọma, mụtara omenala ndị obodo ha, maka na ọ bụ asụsụ bụ ojiji ji ihe niile mmadụ na-eme na ndụ. Edemede a na-eleba anya n’ụzọ na-aghaghị isi n’asụsụ mee ka obodo na-eto eto, gaa n'ihu, kpoo ọkụ ma chakee, ọkachasị site n'asụsụ Igbo. Chetakwa na nkụ dị na mba na-eghere mba nri. Ihe onye kpọrọ nwa nkịta ya ka ọ ga-aza. Site na ngwaụlọ ruo na ndị a na-eyi n’ahụ, ndị e ji achọ mma, na ndị e ji arụ ọrụ dị iche iche, ma ọ bụ eri eri ha niile bụcha asụsụ nne nke e ji echepụta, ahazi, ewube, echekwa ma kọwapụta ha maka mwulite obodo. Site n’enyemaka ndị ọrụnka, ndịọkammụta, ndị ọmụmụ sayensị na nkanụzụ, ndị na-edepụta mpụtaraokwu na ọkọwaokwu ka asụsụ nne si eme ka sayensị na technụzụ na mbaụwa pụta ihe. Ndị na-ejighi asụsụ nne maọbụ asụsụ ogige kpọrọ ihe na-ewelara anyị aka elekere azụ. Ọ bụkwanụ onye ga-anapụta enwe iko o ji n’aka?