EJIJE IGBO NA NDỤ NDỊ IGBO N’OGE GBOO NA OGE UGBUA: NSOGBU NA OLILEANYA
Abstract
Ejije Igbo bụ otu ụzọ pụrụ iche ndị Igbo si ezipụta omenala na nkwenye ha. Mana taa, ụfọdụ ndị Igbo, ọkachasị ụmụntakịrị ndị na-eto eto anaghịzị enwe mmasị na ya. Nke a kpatara na ejije Igbo ahapụla n’ama na obom ebe a na-egosipụta ya n’oge gboo ma banyezia n’ihe nkiri televishọnụ. Ọ bụ eziokwu na nke a bụkwa mwuli elu ọkpụtọrọkpụ nye ejije Igbo mana nsogbu bụ na ụfọdụ ihe ndị ha na-egosipụta na ya abụghị nkwenye na omenala ndị Igbo. Arụrụala dị iche iche dị ka; mmadụ ịgba ọtọ, ịgwọ ọgwụ na ịgbagbu mmadụ. Ha na-agwọkọrịkwa asụsụ dị iche iche. Ebumnobi nchọcha a bụ ka e nyochaa ejije Igbo na ndụ ndị Igbo n’oge gboo na n’oge ugbu a ma zipụta ha dị ka nkuzi nke ọbụla si dị, iji mata nke na-egosipụta nkwenye na omenala ndị Igbo bụ ihe mmụta ejije Igbo na-egosipụta. A gbasoro usoro sọvee rịsaachị mee nchọcha a. A gara n’ọba akwụkwọ ma gbakwaa ndị mmadụ ajụjụ ọnụ gbasara ejije Igbo. A gbasoro atụtụ ọdịdị na nchọcha a, n’ihi na ọ bụ ya dabara nke ọma n’ileba anya n’ihe ndị e ji mara agụmagụ dị ka, nhazi, asụsụ, agwa na ihe niile gbasara agụmagụ ahụ n’onwe ya. A chọpụtara na ihe nkiri ejije ụmụaka na-ekiri na-agbanwe omume ha n’ụzọ ebimndụ ha n’ihi na ihe ọbụla nwata na-ekiri na-abanye ya n’isi ozigbo. Ọzọ bụ na ọtụtụ ejije ndị gosipụtara nkwenye na omenala ndị Igbo kpọmkwem, dị ka o kwesiri ịgbazi ndụ na ikuzi ezi akparamagwa, dị ọtụtụ n’ọnụọgụgụ ha ji asụsụ Bekee kụpụta. Ọ bụ eziokwu na egwu niile, ụfọdụ akụkọ ifo, ilu ụfọdụ na aha niile ha zagbadoro n’ejije ndị ahụ bụgbado n’asụsụ Igbo. Ụfọdụ agwa so n’ejije ndị ahụ abụchaghị ndị Igbo.Nchọcha a ga-atụnye ụtụ nke ya n’ihe gbasara amụmamụ ejije Igbo. Ọ ga-abụrụ ndị ga-eme nchọcha n’isiokwu a ebe mgbakwasa ụkwụ ma mee ka arụrụala dị iche iche a na-ahụta n’ejije Igbo n’oge ugbu a belata. Onye nchọcha na-atụnye aro ka ndị na-emepụta ejije Igbo mewaga ejije Igbo ghara ịdị na-eṅomite obibi ndụ ndị ọcha nke abụghị obibindụ e ji mara ndị Igbo. Ọzọ bụ na onye nchọcha na-arịọ ka ndị gụrụ asụsụ Igbo na ndị nwere mmasị gbasara iwulite asụsụ na omenala ndị Igbo tinye anya n’ihe nkiri obodo anyị ma rịọkwazia enyemaka ndị gọọmentị maka nkwado ihe nkiri ọ kachasị ndị metụtara nkwenye na omenala Igbo, ma kaba ahụ chịkọba ọgbakọ bụ ndị ga na-ahụ maka ejije ndị Igbo, mara ma ọ bụkwa nke na-akuzi ihe, nye ndụmọdụ, katọọ agwa ọjọọ ma tokwaa agwa ọma tupu ha enye ikike ịkụpụta ya n’ihe nkiri televishọnụ. Nke a ga-eme ka e nye ejije ọdịnala Igbo ogo ruru ya ma mekwaa ka ndị ala anyị bido inwe mmasị na ya ọzọ.