NNYOCHA LINGWISTIK MKPARỊTAỤKA: MKPARỊTAỤKA WASAP DỊ KA IHE NLERE ANYA

Authors

  • Patience Chikaodili Okoye & Chinweude Nwakaego Ugochukwu Author

Abstract

Nchọcha a lebara anya na mkparitaụka ọwa ozi wasap iji chopụta mkpụrụokwu ọhụrụ ndị a na-ejizi akparịta ụka. E nwere mkpalite ime nchọcha a n’ihi nsogbu ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe n’ịghọta mkpụrụokwu e ji akparịta ụka n’ọwa ozi wasap. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta mkpụrụokwu ọ gbara ọhụrụ dị iche iche e ji enwe mmekọrịta n'ọwa ozi wasap nke ndị mmadụ anaghị aghọtacha na ịmata ebe dị iche iche ha na-abanye n'ọwa wasap. Ọzọ, ka a mata ọgbatauhie ndị nwere ike ịdị n'iji akara ndị a were kpaa nkata n'ọwa ozi wasap na ụzọ a ga-esi gbochie ọgbatauhie ndị ahụ. Usoro nchọcha a gbasoro bụ nke nkọwa. E sitere n'ọwa ịntanetị nakwa ajụjụ a gbara ụfọdụ mmadụ nwete ngwa nchọcha. A chọpụtara akara ndị mmadụ anaghị aghọtacha, ụfọdụ n'ime ha bụ: LOL, LLL, LMAO, TGIF, FYI, ROFL na NVM. A kọwara ihe mkpụrụokwu ndị a pụtara na na ebe ha na-abata na mkparịta ụka wasap. Nchọcha a ga-abara onye ọ bụla uru ịghọta mkpụrụokwu ndị a n’ihi na e ji Igbo Izugbe depụta mpụtara nchọcha. Ọ ga-enye aka ka ndị mmadụ mara mkpụrụokwu dị iche iche e ji akparịta nkata n'ọwa ikuku wasap na mpụtara ha.

Downloads

Published

2024-12-05