ODEZURUIGBO: AN INTERNATIONAL JOURNAL OF IGBO, AFRICAN AND COMMUNICATION STUDIES

Authors

  • Editor-in-Chief Author

Abstract

Odezuruigbo bụ Jọnal nke Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi, Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka. Aha a bụ okwu Igbo nke pụtara “Ihe jezuru ebe niile”. Ude ya na-edezu na mba niile site na Gọọgụl na Ntaneetị. Nke a mere na Jọnal a, dị ka aha ya gosipụtara, metụtara mmadụ niile na mba niile. Ebumnuche Jọnal Odezuruigbo hiwere isi n’ime ka a mara na ọ dị mkpa iji asụsụ Igbo depụta edemede nchọcha e nyochara nke ọma. Nke a ga-enye aka n’ịkwalite asụsụ Igbo, ma mee ka ọ na-eto eto. Ọ na-anabatakwa edemede e dere na Bekee nke na-ewelite ogo asụsụ, omenala, amamihe, nsirihụ ụwa na njirimara ndị Igbo. Nke a pụtara na ọ na-anabata edemede n’atụmatụ ọ bụla metụtara ọdịmma ndị mmadụ, akụkọ ntọala, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, agụmagụ, ekpemekpe, omenala, agụmakwụkwọ, ọchịchị, nkanụzụ, w.d.g.

Downloads

Published

2024-12-05