NTỤLEKỌRỊTA ABỤ EGWU IMỌKA NA NDỤ NDỊ ỌKA N’OGE GBOO NA N’OGE UGBU A
Abstract
Isiokwu ederede nchọcha a, gbadoro ụkwụ na Ntụlekọrịta Abụ Egwu Imọka na Ndụ ndị Ọka N’oge gboo na N’oge Ugbu a. Abụ ọdịnala nke Egwu Imọka bụ otu n’ime ya, bụ nke dịbara kemgbe gboo sitere n’aka nna nna anyị ha ruo anyị aka, ma bụrụ n’ọnụ ka a na-agụ ya. Abụ Egwu Imọka bara uru na ndụ ndị Ọka n’ihi na ha na-esite na ya akụziri ụmụ ha eziakparamagwa nkwenye ha, ụdị ndụ ha na ka ha si ahụ ihe. Ma taa ndị Ọka legharịrị ọrụ niile ndị a abụ Egwu Imọka na-arụ anya, ha anaghịzị enwe mmasị na ya. Ndị ọgbaraọhụrụ na-agbaso usoro ndị ọcha nke adịghị egosipụta nkuzi, eziakparamagwa na mmetụtaobi e bu n’uche. Ọ bụ ya kpatara ọrụ nchọcha a, iji chetara ndị Ọka ezi nkuzi dị n’Abụ Egwu Imọka ha. Usoro a gbasoro mee nchọcha a bụ nke a kpọrọ sọvee rịsaachị. Nke a pụtara ịga n’obodo ebe e ji mee nchọcha a gbaa ndị mmadụ ajụjụ ọnụ ma chọpụta kwa ihe ndị dị mkpa na nchọcha a. Ọ bụkwa atụtụ ọkpụ ka a gbasoro mee nchọcha a. A chọpụtara na Abụ egwu Imọka n’oge gboo na-akuzi eziakparamagwa, obibi ndụ ọma ma na-ezipụta ihe dị iche iche e ji mara ndị Ọka. Ebe Abụ egwu Imọka nke oge ugbu a bụ naanị ajọ omume dị iche iche ka ha na-akuziri ndị ọgbaraọhụrụ bụ nke na-akpata ndụ ha na-ebi ka a ga-asị na isi akpakọchara ha ọnụ. A tụrụ anya na nchọcha a ga-aba nnukwu uru maka na ọ ga-enye aka ichetakwara ndị Ọka maka ezi nkuzi dị n’Abụ Egwu Imọka ha na ọrụ abụ ndị a na-arụ dị ka enyo nsirihụndụ ha na ịgbai ndụ ndị ọgbaraọhụụ. Ọ ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ nye ndị nchọcha gbasara isiokwu a. Ọrụ nchọcha a na-atụnye aro ka ndị Ọka niile ihe gbasara Abụ ọdịnala na-amasị gbakọọ aka ọnụ na-ịkwalite na-iwulite ọnọdụ Abụ Egwu Imọka ha dị ka ọ dị n’oge gboo maka ezi nkuzi dị na ya ma nyekwa aka ime ka nke ndị ọgbara ọhụrụ a so akpata ka a ga-asị na isi akpọkọchara ha ọnụ nkeọma nyụọ ka ọkụ.