MMEMME Ị́GBÁ ÙCHÉ N’OBODO ỌHAFỊA

Authors

  • Ann Chinazo Onyekelu, PhD & Obianuju Maryjane Awa Author

Abstract

Mmemme Ịgba Uche so n’otu n’ime emume ndị mmadụ na-eme nke na-eweta ịdị n’otu n’etiti ndị obodo na ndị ọgbọ. Ọ bụ ihe mwute na ndị mmadụ n’oge ugbua, ọkachasị ndị Ọhafịa anaghị enwe mmasị n’ebe mmemme ọdịnala ha dị dịka Mmemme Ịgba Uche nke adịghị ka ọ dị na mbụ, nke a mere na ya bụ ugo Chukwu tubere Ọhafịa na-ada ka ibube ọkụ taa. Nsogbu dị etu a mere ka ndịnchọcha sie ọnwụ ma chọpụta ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ. N’ihi ya, ebumnobi ndịnchọcha bụ ịchọpụta ka mmemme Ịgba Uche si malite n’obodo Ọhafịa, ịchọpụta oge e ji eme mmemme Ịgba Uche n’obodo Ọhafịa, ịchọpụta ụzọ dị iche iche e ji akwado mmemme Ịgba Uche, ịmata ka mmemme Ịgba Uche si dị n’oge gboo nakwa n’oge ugbua, ịchọpụta ndịiche dị n’etu ndị Ọhafịa na ndị obodo ọzọ sị eme mmemme Ịgba Uche na ịkọwapụta uru na ọghọm dị na mmemme a. Usoro a gbasoro were mee nchọcha a bụ usoro nke sọvee. Ndịnchọcha gara n’obodo Ọhafịa nke dị n’okpuru ọchịchị Ọhafịa na Steeti Abịa weere jụọ ndị okenye maara ihe gbasara Mmemme Ịgba Uche ajụjụ. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ atụtụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya (Social Theory), nke Thomas Schellings tụpụtara n’afọ 1977. A chọpụtara na ndị Ọhafịa anaghịzi eme Mmemme Ịgba Uche dịka ha si eme ya n’oge gboo. A chọpụtakwara na ụfọdụ ndị ntorobịa Ọhafịa, amaghị ihe gbasara Mmemme Ịgba Uche, nke ha ji ama ụbọchị a na-eme ya n’obodo ha. Nchọcha a ga-abara ọhaneze oke uru n’ihi na ha ga-esite na ya mata maka mmemme Ịgba Uche, mgbe ọ malitere nakwa ka e si eme ya. Ọ ga-eme ka ndị obodo Ọhafịa mara mkpa ọ dị ijidesi ejirimara ha ike, ma nyekwa aka n’ịkwalite agụmagụ ọdịnala.

Downloads

Published

2024-08-05