NZIPỤTA MKPEBI NKE ONWE NA MMETỤTA YA NA NDỤ N’EJIJE NDỊ A HỌỌRỌ

Authors

  • Anagor, Chioma Chiazom & Okm. Nkechinyere Nwokoye Author

Abstract

Inwe mkpebi bụ ihe onye ọbụla na-eme na ndụ ya. E nwere mkpebi dị mma na nke dị njọ mana nchọcha a lebara anya na ndị dị njọ nke na-ebute akparamaagwa dị aṅaa nke a maghị ebe ọ ga-eduba onye ahụ n’ọdịniihu maọbụ ihe ọ ga-ebutere ya maọbụ ndị ọzọ n’ụzọ ndụ ha. Ọtụtụ enweela mkpebi megidere ọdịniihu ha na nke ụmụ ha n’ihi na ha echemighị echiche ime banyere ọnọdụ ha hụrụ onwe ha n’ime ya. Naanị ihe ha chọrọ bụ ka ha mezie ọnọdụ ha ugbu a n’ihi na echi ga-echere onwe ya mana ogee chi bịara, ha ahụ na ọ bụghị ihe isi ha ga-ebunwu. O nwere ike were ndụ mmadụ ebe a na-achọ ụzọ mgbapụ dị ka ndị ntorobịa oge a na-ekpebie ime ihe ọbụla ha nwere ike ime iji bute ego ọsọkwa ya bụrụ ihe ga-ewe isi ndị ezinaụlọ ha, ha ọchọghị ịma. Ya mere ndị nchọcha a ji lebaa anya n’isiokwu a iji zipụta ọghọm inwe mkpebi ọjọọ na-ebute n’ikpeazụ ka onye ọbụla gbaa mbọ chemie echiche ime tupu ha e kpebie ihe ọbụla ka a gbanarị ngaramara n’ikpeazụ. Ihe ndị a niile mere ndị nchọcha ji họrọ ejije Nwata Rie Awọ, Ije Ụwa na Adaakụ iji zipụta ka ndị odee ejije Igbo ndị a si ezipụta mkpebi onwe na mmetụta ya na ndụ. Ndị nchọcha gbasoro Usoro nkọwa ma were atụtụ saikoanalisis nke Sigmund Freud tụpụtara n’afọ 1895 iji mee ka isiokwu a doo anya. Ha chọpụtra na e nwere ihe kpatara mmadụ ji akpa ụfọdụ agwa maọbụ nwee mkpebi dị aṅaa na ndụ, nke na-abụkarị n’ihi ọnọdụ ọ hụrụ onwe ya n’ime ya. Nke a mere o ji dị mkpa ka onye ọbụla lebaa anya n’ụdị mkpebi ọ na-enwe banyere ọnọdụ ọbụla n’ihi na ọ naghị adịgide. Ọ dịghị ọnọdụ maọbụ ihe mmadụ na-agabiga enweghị ụzọ mgbapụta, mana ọ bụrụ na onye ahụ mee ngwangwa inwe mkpebi, ọ ga-emebi ihe na ngwụcha nke ga-ajọkarị udele ma sikarịa nkakwụ.

Downloads

Published

2024-08-05