ỌNỌDỤ NGWA NKỤZI IHE ỌKPỤ AKPỤRỤAKPỤ N’ỌMỤMỤ ASỤSỤ NA OMENAALA IGBO N’OGO SINỊỌ SEKỌNDỊRỊ N’OKPURU ỌCHỊCHỊ NSỤKA STETI ENUGU
Abstract
Nchọcha a lebara anya na ọnọdu ngwa nkụzi ihe ọkpụ akpụrụakpụ n’ọmụmụ asụsụ na omenaala Igbo n’ogo Sịnịọ Sekọndịrịn’ okpuru ọchịchị Nsụka na Steti Enugwu. Ngwa nkụzi ihe ọkpụ akpụrụakpụ bụ akọrọngwa ọrụ mabụrụ ihe ndị ahụ ejiri aka rụpụta n’oge gboo, na-enye aka ezipụta ihe omenaala ndị Igbo nakwa ka ndị si ebi ndụ ha n’oge mgbe ochie. Ọbụ ihe nwute naechiche ụmụakwụkwọ adịghịzị n’ebe omenaala agbụrụ nna ha dị nke nwere ike isite n’ enweghi ezi mgbazi. Ụfọdụ ndị nkụzi asụsụ Igbo anaghị e ji ngwa nkụzi ihe ọkpụ akpụrụakpụ akụziri ụmụakwụkwọ asụsụ na omenaala Igbo n’okpuru ọchịchị Nsụka na steti Enugu nke mere na nkụzi na ọmụmụ asụsụ na omenaala Igbo na-ala azụ ma na-anwụ anwụ.Ajụjụ nchọcha atọ ka eguzobere maka ọrụ nchọcha a. Usoro nchọcha e ji mee nchọcha a bụ sọvee nkọwa, nke e ji usoro nsere simpụl randọm wepụta ụlọakwụkwọ ise n’ime ụlọakwụkwọ iri atọ na abụọ e nwere n’okpuru ọchịchị Nsụka. Ọnụọgụ ndị nkụzi e ji mee nchọcha a dị iri ise (50). Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ ajụjụ ederede njụmaza n’ọnọdụ ngwa nkụzi ihe ọkpụ akpụrụakpụ n’ọmụmụ asụsụ na omenaala Igbo (ỌNNIỌAỌAOI) dị iri na abụọ (12) n’ọnụọgụ nke ndị ọkammụta abụọ n’asụsụ Igbo na mahadum Naịjirịa Nsụka nakwa otu onye “Measurement and Evaluation” nyochara ma kwenye na ọ dabara na nchọcha e ji ya eme. E ji ndị nkụzị dị iri (10) mee nnwale ntukwasiobi ngwa nchọcha nke nyere akara ntụkwasịobi 0.78. Nke a gosiri na ngwa nchọcha a nwere ntụkwasịobi. Nchọpụta gosiri na ọkpụrụkpụ ihe na-ebute ndaghachi azụ n’iji ngwa nkụzi ihe ọkpụ akụzi asụsụ na omenaala Igbo bụ maka na gọọmentị anaghị ebute ngwa nkụzi ihe ọkpụ akpụrụakpụ n’ụlọakwukwọ. Ọzọ, ndị nkụzi anaghị eji ngwa nkụzi ihe ọkpụ akụzi asụsụ na omenaala Igbo oge ụfọdụ. Onye nchọcha tụpụtara aro ka gọọmentị malite ibute na ịrụpụta ụlọ ngwa nkuzi ihe ọkpụ akpụrụakpụ omenaala ndị Igbo maka igosịpụta ihe omenaala ndị a n’ ihụ ụmụakwụkwọ.