ỌNỌDỤ ASỤSỤ IGBO N’Ọ̀GBỌ́ A: USORO MWULITE YA

Authors

  • Orji, Ethel Odinakachi & Amamgbo, Constance Onyinye Author

Abstract

Nchọcha a lebara anya n’ọnọdụ asụsụ n’ọ̀gbọ́ a: usoro mwulite ya. Ebumnobi nchọcha a bụ; ịchọpụta ọnọdụ asụsụ n’oge gboo nakwa n’oge ugbua nakwa ????̀????????̀ dị iche iche nyerela aka n’ịkwalite asụsụ Igbo dị ka otu Sụwakwa Igbo. Nchọcha a lebakwara anya n’ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite asụsụ Igbo. Asụsụ Igbo nọ ka ụgbọ mmiri na-enweghị onye na-akwọ ya, ebini mmiri buru ya gbagoo, o bukwara ya gbadaa. Nke a were bụrụ n’ihi ajọ akparamagwa ndị Igbo na-akpaso asụsụ Igbo. A gbasoro usoro nke nkọwasị wee mee ntụcha dị na nchọcha a. E ji atụtụ njirimee were tụchaa nchọcha a. Ezigbo ntọala nwa nchọcha nwere n’asụsụ Igbo nakwa akwụkwọ dị iche iche metụtara isiokwu a, a gụrụ nyere aka n’ebe ọ pụrụ iche n’inweta ngwa nchọcha a. A chọpụtara na e nweela ????̀????????̀ dị iche iche iche gbarala mbọ n’ịkwalite asụsụ Igbo n’oge gboo dị ka ????̀t???? ̀Mwulite Asụsụ na Omenaala Igbo nakwa ????̀t???? ̀ Sụwakwa Igbo bụ ndị nke ka na-agbakwa mbọ n’ịkwalite asụsụ Igbo n’oge ugbua. A chọpụtara na ọ bụ agwa ọjọọ ụmụ Igbo na-akpaso asụsụ ha mere na asụsụ Igbo ji anyụ ọkụ. Nchọcha a ga-abụ ngwaa nkuzi nye ndị nọ n’amụmamụ asụsụ ọbụla tụmadụ asụsụ Igbo. Ọ ga-abara ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ uru n’ihi na ọ ga-etinyeso na ngwa nkuzi nke asụsụ Igbo. Nwa nchọcha na-atụ aro ka e mekwuo nchọcha n’isiokwu a n’ọdịniihu n’ihina nke a ga-enye aka n’ịkwalite asụsụ Igbo.

Downloads

Published

2024-08-05