Ntụlekọrịta Akanka Okediadi Na Obidiebube N’ejije Ha

Authors

  • Okeyika, Juliet Ifunanya; Okoh, Patience N. Author

Keywords:

Agụmagụ, Akanka, Ejije

Abstract

Nchọcha edemede a, lebara anya n'akanka odee abụọ na etu ha siri zipụta ya n'ejije ha ndị a họọrọ. Akanka bụ ngalaba sayensi asụsụ na-eleba anya na nka dị iche iche nakwa usoro onye odee siri zipụta ebumnuche ya n'akwụkwọ ọkachasị n’agụmagụ ya. Odee abụọ a họọrọ wee mee nchọcha a bụ Okediadi na Obidiebube. Odee ọbụla nwere ka o si ezipụta akanka ya n'agụmagụ ya. Oge ụfọdụ, nghọta agụmagụ na-ahịa ọgụụ ahụ n’ihi aghọtaghị etu odee siri zipụta akanka ya n’agụmagụ ya. Ọ bụ nke a kpaliri nchọcha a, iji mara ka odee ndị a si zipụta akanka ha n’ejije ha. E mere nchọcha a site n'ịgbado ụkwụ n'akwụkwọ agụmagụ ejije abụọ ndị a; Ihe Onye Metere na Ọnọdụ Ugo. A gbasọrọ usoro nkọwa, n'ihi ya a gụrụ akwụkwọ ndị a họọrọ nakwa akwụkwọ ndị ọzọ metụtara akanka. Atụtụ akanka ka e jiri wee nyochaa akwụkwọ ejije ndị a họọrọ. Ebumnobi nchọcha a ya bụ; ịmata ihe bụ akanka, iwepụta ma gosipụta ọrụ asụsụ nakwa atụmatụ asụsụ, myiri na ndịiche akanka odee abụọ a, tinyere ọrụ atụmatụ agụmagụ na-arụ n’ime ejije ndị a họọrọ. A chọpụtara na odee abụọ a nwere myiri na ndịiche n’etu ha si ezipụta akanka ha nke gosiri na ha bụkwa ndị na-ejikarị ilu, akpaalaokwu, egbeokwu d.g.z ezipụta akanka ha n’agụmagụ ha. Nchọcha a ga-abara ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ uru, ọkachasị ndị nọ na ngalaba agụmagụ, ịghọta ihe gbasara akanka ndị odee abụọ a, a họọrọ ma gbakwaa mbọ ịchọpụta akanka ndị odee ndị ọzọ ga, site n’ịgụ akwụkwọ agụmagụ ha. Ọzọ bụ na nchọcha a ga-enye aka n’ịkwalite agụmagụ ederede Igbo.

Downloads

Published

2023-09-06