Ntụcha Abụ Ikpe Ndị A Họọrọ
Abstract
Agụmagụ Igbo nwere ngalaba atọ nke abụ bụ otu n’ime ha. E kwuwe ekwuwe, ndị mmadụ anaghị etinyecha uche ha n’ịgụ abụ dịka ha na-etinye na akụkọ na ejije n’ihi na ha na-ahụta ya dịka ihe anaghị ekwe nghọta. Nke a bụ n’ihi na ọ na-akpị okwu akpị mere na a ga na-echeba echiche ime ka e were ghọta ya. Nsogbu a kpaliri mmụọ nwanchọcha ime nchọcha a. Onye nlebanye anya n’abụ ga-abụ onye nwere mmasị n’abụ, mara ndụ ndị, omenaala na akụkọala ndị abụ ọ na-eleba anya gbadoro ụkwụ na be ha. Abụ nwere ngalaba dị iche iche dị ka ngala agụmagụ ndị ọzọ bụ akụkọ na ejije si nwee. Ngalaba abụ e ji rụọ ọrụ na nchọcha a bụ abụ ikpe ụfọdụ sitere n’akwụkwọ abụ Akpa Uche nke R. M. Ekechukwu chọkịbara, Ụtara Ntị nke Nolue Emenanjo chịkọbara na Izunwanne nke O. R. Ifeka, O. T. Nsolibe na T. U. Ezechukwu dere. Enyochara abụ atọ – otu si n’Ụtara Ntị, otu si n’Akpa Uche ebe otu si n’Izunwanne. E ji usoro nchọcha nkọwa mee nchọcha a. A chọpụtara na ọtụtụ oge, ọ na-ara ndị mmadụ ahụ ịgwa ụfọdụ mmadụ eziokwu n’ihu maọbụ kwuo ihe gbowam otu o siri dị niihi ya, ọtụtụ oge a na-eji abụ ikpe agwa mmdụ, ndị ụka, ndị ọchịchị, otu na ọhaobodo ihe ọjọọ ha na-eme. Ọzọ, a chọpụtakwara na nghọta abụ na-ahịa ndị mmadụ ahụ n’ihi na nhazi ya dị iche. Nghọta ya chọrọ ezi akọnuuche maka na asụsụ e ji dee ya na nhazi ya na-esiri ndị mmadụ ike nghọta. Nchọcha a ga-enye aka ịmata uru dị na nkuzi na mmụta abụ dị ka ọ dị n’abụ ndị e nyochara. A na-atụta alo ka a na-eleru anya ala ma cheba echiche ime mgbe a na-agụ abụ maka na nke a ga-eme ka nghọta ya dị mfe ma mee ka ihe abụ chọrọ ikuzi see elu. Ọzọ, ka ndị nkuzi na-amalite n’oge were kuziwere ụmụakwụkwọ abụ ma were ezi usoro ka ha were nwee ike na-aghọta abụ tụmadụ nkuzi abụ ikpe na-akụzi.