Ntucha Abụ Edereede Igbo Ụfọdụ A Họọrọ Dịka Enyo E Ji Ahụta Ebimndụ N’ụwa
Abstract
Agbụrụ ọbụla na-enwe abụ na-ezipụta ebimndụ ndị nwe ya. Niihi nke a nchọcha a họọrọ abụ Igbo ụfọdụ dị n’akwụkwọ abụ Izunwanne nke Ifeka R. O. chịkọbara n’afọ 2010. Ndị bipụtara ya bụ ụlọọrụ Perfect Image dị n’Ọnịcha. Abụ dị n’ime akwụkwọ ahụ dị iri ise na ise sitere n’aka ndị odee atọ. A kọwara n’abụ ndị a ‘Ọchịchị’ na ‘Ego’ dịka enyo e ji ahụta ebimndụ ndị Igbo n’ụwa. Ebumnobi nchọcha a bụ isi n’abụ ndị a gbaa n’anwụ ihe na-ebutegasị nsogbu e nwere n’ọhaobodo nke sitere n’aka ndị ọchịchị nakwa etu ndị mmadụ sie bi ndụ n’ụzọ achụmnta ego nke wetara mmegbu, ntọrị, ogbugbu, ntaramaahụhụ n’ebe mmekọrịta mmadụ na ibe ya dị. Ọzọ bụ iwepụta akanka na atụmatụokwu odeabụ ji chọọ abụ ya mma wee zipụta mmetụtaobi na echiche ya gbasara isiokwu abụ ya. A chọpụtara na abụ ndị a zipụtachara ka mmadụ si ebimndụ ha tụmadị enweghị ezigbo ebumnobi n’ebe ndị ha na-achị, ma tinye ha na nsogbu, n’ihi nleghara anya ha na-eme n’ihe ga-enyere ha aka na ndụ. Ụdịdị ebimndụ a ka a gbara n’anwụ ma katọọ ya, wepụta nka mma ga-enye aka ịkwalite ezimmekọrịta n’ebe ebimndụ n’ọhaobodo. A chọpụtara n’ọrụ a ma wepụta atụmatụokwu ụfọdụ gosiri ajọ ọchịchị ndị ọchịchị na ụzọ a esi achụ ego adịghị mma. A na-atụ alo ka esite na nchọcha a na-akụzi e nyere gbanwee echiche ọjọọ na ajọ akparamaagwa ahụ ma mewe nke dị mma.