Nsirikwụrụ Obibi Ndụ Ndị Mmadụ Oge Agha: Nzipụta Ya N’iduuazị Ụfọdụ

Authors

  • Obiageli T. Nsolibe & Lynda C. Ononye Author

Abstract

Nchọcha a nke isiokwu ya bụ Nsirikwụrụ Obibi Ndụ Ndị Mmadụ Oge Agha: Nzipụta ya n’Iduuazị Ụfọdụ. Agha bụ ọnọdụ enweghị udo na ndụ. Nke a bụ eziokwu n’ihi na agha abụghị ihe mmadụ kwesịrị ịhụ n’anya ma ya fọdụkwa iso nụ agha. Nwanchọcha nwere mkpali mmụọ ime nchọcha n’isi okwu a ka o mee ka a mata tụmadị ndị ahụbeghị agha ọtụtụ nsogbu so agha dị ka oke agụụ, ụkọ, igbusịsị mmadụ na nsogbu ndị ọzọ. Ihe ndị a ka ọ chọrọ ịgba n’anwụ ka ndị mmadụ zeere agha maka na ọgụ bụ ọnwụ. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta ihe agha na-emegasị n’obibi ndụ ndị mmadụ. Nwanchọcha chọpụtara na agha bụ ihe jọgburu onwe ya n’obibi ndụ ndị mmadụ nke na-eweta ọtụtụ nsogbu dị iche iche dị ka ọ dị n’iduuazị ndị a bụ Isi akwụ dara n’ala na Jụọ Obinna nke Ubesie T. U. dere. Ọ chọpụtakwara na agha na-ebute ọnwụ, ntisa, esemokwu, agụụ, ọrịa na ọtụtụ ihe ndị ọzọ n’ezinụụlọ dị iche iche nakwa n’obodo. Nwanchọcha na-atụnye alo ka e lebanye anya n’ọtụtụ ihe ndị ahụ na-ebute agha ma mee ihe ndị a ka ha kwụsị ka udo wee dị.

Downloads

Published

2025-07-22