Nkwenye Ndị Igbo Na Mmehie Nwere Ụgwọ: Ntucha Agumagụ Igbo Ụfọdụ
Abstract
N’ ala Igbo mmehie bụ ihe ndị Igbo na-asọ nsọ dịka akparaagwa ọjọọ dị iche iche. Mmehie ndia bụ igbu mmadụ, mmadụ ịlụ nwa ya maọbụ mmadụ ịdịna nwa ya, mmadụ ire nwanne ya, iweghara ihe onye ọzọ n’ike, mana otu ihe pụtara ìhè bụ na mmehie ọbụla mmadụ mere nwere ụgwọ. Ọ bụ ya mere nwanchọcha jiri hụta ya dịka ihe ga-abara ọhaneze uru bụ ịgba n’anwụ ihe nwere ike ịbụ ụgwọ ọrụ onye mmehie site n’ileba anya n’akwụkwọ Igbo atọ ndi a họọrọ bụ “Chi Nwata Kwe”, “Onye Lọrọ Mkpụrụ Udara” nke Ọ.R. Ifeka dere na “Nwata Rie Awọ” nke G.O Onyekaọnwụ dere, iji zipụta ụgwọ mmehie pụtara ihe na ha. Nke a ga-enye aka kụziere ọhaneze ihe bụ mmehie, na ihe ndị nwere ike ịbụ ụgwọ ọrụ ya, nke a ga-enyekwa aka hazigharia usoro obibi ndụ ha ma mee ka ha malite kpaba agwa ziri ezi nke ga-enye aka maka ọdịmma obodo. N’ikpeazụ, a chọpụtara na n’ime akwụkwọ Ifeka na Onyekaọnwụ, ha wepụtagasịrị mmehie dịgasị icheiche a na-eme n’ala Igbo na ụgwọ ọrụ dịịrị onye ọbụla mehiere