Abụ: Ngwa Nkọcha Nhazi Na Mgbazi Akparamaagwa N’ọha Obodo
Abstract
Abụ dị ka otu ngalaba agụmagụ Igbo jupụtara n’amamihe pụrụ iche. N’ọmụmụ agụmagụ Igbo, a na-elebakarị ọmụmụ agụmagụ ejije na iduuazị anya karịa agụmagụ abụ ma chefuo na ọtụtụ ihe mmụta, nkuzi na mgbazi usoro ime ihe ga-abawanye amamihe mmadụ ma weta udo na agamnihu jupụtara na ya. Nke a ga-akwalite ọdịmma na agamnihu mmadụ na nke obodo. Ọ bụ ya kpalitere nchọcha a nke ebumnuche ya bụ inyocha abụ nkọcha atọ dị n’akwụkwọ Uche Bụ Ahịa, ‘Obodo m’, ‘Oge Eruola Mgbe E Ji Awa Anya’, na ‘Nganga’ ndị Ikeokwu na Onyejekwe dere n’afọ 2009. E ji usoro nkọwa mee nchọcha a ma were atụtụ nchọcha funkshọnalizm bụ nke gbadoro ụkwụ na ka mmadụ si akpa agwa n’ọha obodo site n’iso usoro ha wubere. A kọwadara abụ ndị a niile ma zipụta ihe e jiri kwuo na ha bụ abụ nkọcha. Nchọcha a nyochara abụ ndị a, wepụtasịa agwa ọjọọ a na-akpa n’ọha obodo dị ka ndị ọchịchị e jighị ndị ha na-achị kpọrọ ihe, akparamaagwa ịma naanị onwe ha na ọdịmma nke onwe ha, nakwa ọnọdụ enweghị olile anya ndị mmadụ hụtara onwe ha na ya. A na-atụtazi alo ka ndị nọ n’isi gbanwee agwa achọghị m ịma a na-ahụta ebe ha nọ, ka ha were ndị mmadụ kpọrọ ihe, ka ha na-eme ihe ndị nọ n’okpuru ha ga-eji hụta ha ka ndị ọnọdụ ọjọọ ndị nọ ha n’okpụrụ na-emetụta ma jisi ike mee ka ihe kawanye mma.