Ntụle Olu Ndị Odee Iduuazị Ụfọdụ Dị Ka Enyo Nghọta Ọnọdụ Na N’ihe Ha Dere
Abstract
Edemede a lebara anya n’ịtụle olu ndị odee iduuazị ụfọdụ dị ka enyo nghọta ọnọdụ ha n’ihe ha dere. N’ihi enweghị mmasị ịgụ akwụkwọ iduuazi ka ọgụụ were mata ọnọdụ odee mere o ji hụ iduuazị e dere otu o si hụ ya kpaliri mmụọ nwanchọcha ime nchọcha a iji mee ka ọhanaeze mata ọnọdụ ya n’agụmagụ iduuazị ya bụ enyo e ji ahụta onye odee n’ihe o dere. Nwachọcha ji atụtụ dikọnskrọnshọn nke sitere n’echemeche Jacques Derrida were mee nchọcha ya. A gbasoro usoro kenkọwa were mee nchọcha a. Nwanchọcha chọpụtara na olu odee bụ ọrụ nka e ji eleba anya n’ọnọdụ odee nọ na ya wee dee agụmagụ ya bụ etu e si achọpụta nke ọma ebe na otu agụmagụ nọrọ kwesị ekwesị, bụrụ ihe ọhanaeze ga-eṅomi ma sị na ya mụta ihe ga-agbanwe nghọta na agwa ha. A chọpụtakwara na olu na-eleba anya n’ihe gbasara onye dere ya bụ agụmagụ, etu obi ya siri wee dị n’agụmagụ ahụ na ihe ọ chọrọ ka ndị mmadụ si na ya mụta. N’ikpeazụ, nwanchọcha tụnyekwara alo ka ndị odee agụmagụ Igbo na-ewebata akanka n’agụmagụ ha na-ede nke ha tụrụ anya na ndị Igbo ga na-agụ iji mata ihe ndị ha amaghị, matakwa ọnọdụ ha bụ ndị odee n’ihe ha dere.