ỤDAOLU N'USORO OKWU IGBO: NDỊICHE SITERE N'OLU NANKA

Authors

  • Chinweude Nwakaego Ugochukwu Author

Abstract

Nchọcha a tulekọrịtara ụdaolu n'olu Nanka na Igbo Izugbe iji chọpụta ma e nwere myiri na ndịiche dị n'etiti ha. A chịkọtara ahịrị okwu iri e jiri mee nchọcha a site n'ọnụ ndị okenye sitere na Nanka ndị o nwebeghi mgbe ha hapụrụ obodo Nanka gaa biri n'obodo ọzọ. A gbasoro atụtụ akụkụ nnọrọ onwe wee tụchaa ahịrị okwu e jiri mee nchọcha. Nchọpụta gosiri na e nwere myiri na ndịiche dị n'etiti olu Nanka na Igbo Izugbe. A chọpụtara na e nwere ụdaolu atọ n'olumba Nanka dị ka ọ dị n'Igbo Izugbe, mana ụda nsụda na-ewete ndịiche n'etiti mkpụrụokwu ụfọdụ n'olu Nanka. A chọpụtakwazịrị na e nwere mkpọgo na mkpọda na-abata n'olu Nanka nke na-adịghị n'Igbo Izugbe. Mkpọgo na mkpọda a nke na-apụta ihe na asụrasụ olu Nanka na-eweta ndịiche pụrụ iche nke na-eme na a na-eji ya amata mgbe onye Nanka sụrụ asụsu. Ebumnobi nchọcha a buikwalite asụsụ Igbo nakwa ikpalite mmụo ndị mmadụ ka a gaa n’ihu n'ịtụle olu mba dị iche iche e nwere n'asụsụ Igbo iji chọpụta ihe ndị ọzọ dị omimi banyere ha nke na-anaghị apụta ihe n'Igbo Izugbe.

Downloads

Published

2025-07-13

Issue

Section

Articles