ODIDE ỌKỌWAOKWU NA IKIKERE MBIPỤTA: NTỤLEKỌRỊTA ỌKỌWAOKWU ECHERUO NA ỌKỌWAOKWU NNAJI

Authors

  • PATRICK IK. UMEZI Author

Keywords:

Ọkọwaokwu, Odide ọkọwaokwu, ikikere mbipụta, Ọkọwaokwu Nnaji, Ọkọwaokwu Echeruo

Abstract

Edemede a bụ maka odide ọkọwaokwu na ikikere mbipụta: Ntụlekọrịta ọkọwaokwu Echeruo na ọkọwaokwu Nnaji. Ihe odee bu n’obi bụ igosi na na-agbanyeghi na ọkọwaokwu niile na-eyi onwe ha, nke ọbụla dị iche n’ebe ibe ya dị. Ọ ga-ezipụta nke a site n’itụlekọrịta ọkọwaokwu Nnaji (1985) na Echeruo (2001). Nke a ga-apụta ihe site n’ịmata agwara ọkọwaokwu Echeruo na agwara ọkọwaokwu Nnaji nakwa ebe ọkọwaokwu abụọ a si yie onwe ha, ya na ebe ha si dị iche. Mgbe e mechara ntụlekọrịta a, ụfọdụ ihe ndị a chọpụtara na myiri dị Na ha bụ ndị a: ha abụọ bụ ọkọwaokwu nhọrọ, ha gbasoro usoro ndịnugbu, ha akọwamighi ọkọwaokwu ha akọwami, ha depụtara okwu nsina dị ka okwu kwụọrọ onwe ya, ha enweghi akụkọ usorookwu, tinyere na ha dị n’ụdị akwụkwọ. Ebe ha si dị iche gụnyere: Echeruo depụtara okwu ndị nwere otu echiche, mana Nnaji edepụtaghị ha, isiokwu Nnaji dị 9,877 mana Echeruo edepụtaghị ọnụọgụ nke ya, Nnaji tinyekwuru eserese iji mee nkọwa ya, mana Echeruo ji naanị mkpụrụokwu na ahịrịokwu mee nkọwa, Echeruo nwere okwu ndịnazụ, mana Nnaji etinyeghi okwu ndịnaazụ ọbụla. Nchọpụta ndị a gosiri na ọkọwaokwu abụọ a kwụọrọ onwe ha maka na ha agbasoghi otu usoro nhazi na usoro nkọwa.

Downloads

Published

2022-09-24

Issue

Section

Articles