AZỤMAHỊA NA NAỊJIRIA NA ỌNỌDỤ ASỤSỤ IGBO NA SENTURI NKE IRI ABỤỌ NA OTU

Authors

  • PATRICK IK. UMEZI Author

Abstract

Isiokwu nchọcha a bụ Azụmahịa na Naịjiria na ọnọdụ asụsụ Igbo na senturi nke iri abụọ na otu. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta etu azụmahịa na Naịjiria si metụta ọnọdụ asụsụ Igbo na senturi nke iri abụọ na otu. Ihe kpalitere ya ime nchọcha a bụ maka na adịmmkpa asụsụ ọbụla gbadoro ụkwụ n’adịmmkpa ndị nwe asụsụ ahụ. Atụtụ mgbakwasa isiokwu nchọcha a bụ atụtụ Ngwakọrịta usoro azụmahịa; nke a kpọrọ Marketing Mix maọbụ 4PS of marketing n’asụsụ Bekee. A bịa na Naịjiria, ndị Igbo kacha pụta ihe n’ihe gbasara azụmahịa. Ihe ọ pụtara bụ na asụsụ Igbo kwesiri ịbụ asụsụ dị mkpa ma na-ewu ewu na Naịjiria; mana ọ dịghị etu ahụ. Nwanchọcha chọrọ ịchọpụta ihe kpatara nke a. Mgbe e mechara nchọcha a, a chọpụtara na a bịa n’azụmahịa na Naịjiria, ọ bụ ndị Igbo kacha pụta ihe na ya. Mana na n’agbanyeghi nke a asụsụ Igbo so n’asụsụ ndị na-alaghachi azụ. A chọpụtara na ihe kpatara asụsụ Igbo ji ada ada bụ na ụfọdụ ndị nne na nna ndị Igbo anaghị asụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo n’ụlọ ha dị iche iche. Ụfọdụ narịị eziga ụmụ ha maka ịgụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ anaghị amụ asụsụ Igbo. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị nkụzi ejighi ya akụzi ihe n’ụlọakwụkwọ. Nke ka njọ bụ na ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-anata ntaramahụhụ mgbe ọbụla ha sụrụ asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ. A chọpụtakwara na ọ na-eme ụfọdụ ndị Igbo ihere ịsụ asụsụ Igbo ebe ndị mmadụ nọ. N’ikpe azụ, a chọpụtara na ihe e nwere ike ime iji mee ka asụsụ Igbo dị elu bụ na ndị Igbo kwesiri ịhụ asụsụ Igbo n’anya ma na-asụ ya ebe ọbụla ha nọ; ndị nne na nna ga-agba mbọ hụ na ụmụ ha na-asụ asụsụ Igbo dị ka asụsụ ire nne n’ụlọ ha dị iche iche. N’otu aka ahụ, ha ga-akwụsị iziga ụmụ ha maka agụmakwụkwọ n’ụlọakwụkwọ ndị anaghị asụ asụsụ Igbo. Ndị gọọmenti, n’aka nke ha ga-enye aka n’ịkwalite asụsụ Igbo site n’ime iwu dị iche iche ga-enye aka maka ọganihu asụsụ Igbo n’ogo agụmakwụkwọ dị iche iche. Ihe ndị a ga-enye aka n’ebe ọ dị ukwuu iji kwalite asụsụ Igbo n’ogo dị elu.

Downloads

Published

2021-09-24

Issue

Section

Articles