ỌJỊ: ERIRI NJIKỌ ASỤSỤ NA OMENALA IGBO

Authors

  • Patrick Ik. Umezi; Florence Uju Ibeh Author

Abstract

Nchọcha a bụ maka ‗Ọjị: Eriri Njikọ Asụsụ na Omenala Igbo‘. N‘edemede a, e bu n‘obi ịchọpụta etu emume ọjị si ejikọta asụsụ na omenala Igbo ọnụ. Mgbe e mechara nchọcha a, a chọpụtara n‘ezie na ọjị bụ eriri jikọtara asụsụ na omenala Igbo ọnụ. Nke a na-apụta ihe n‘ụzọ dị iche iche; dị ka mgbe a na-agọ ọjị Igbo n‘omenala Igbo, ọ bụ naanị n‘asụsụ Igbo ka a na-eme nke a, maka na ọjị anaghị anụ asụsụ Bekee. Nke ọzọ dị ka o si dị n‘omenala Igbo, ọji na-agwa ndị Igbo okwu site n‘ibe ole ọjị ahụ gbara. N‘otu aka ahụ, ndị Igbo na-eji ọjị agwa Chineke na ndị nna nna ha okwu n‘asụsụ Igbo.

Downloads

Published

2022-09-24

Issue

Section

Articles