Echiche Ndịnime N’agụm aha Mmadụ N’ala Igbo
Keywords:
Echiche, Ndịnime, aha mmadụ, IgboAbstract
Nchọcha a bụ maka Echiche ndịnime n’agụm aha mmadụ n’ala Igbo. Ihe nwa nchọcha bu n’uche bụ ịchọpụta echiche miri emi dị n’aha ndị Igbo na-agụ mmadụ. Atụtụ a gbasoro na nchọcha a bụ atụtụ echiche Park (2010). Mgbe e mechara nchọcha a, a chọpụtara na ndị Igbo nwere echiche miri emi dị n’aha dị iche iche ha na-agụ mmadụ. Ya bụ na e nwere ihe ndị kpatara ha ji agụ mmadụ aha dị iche iche. Echiche ndị a sitere na nghọta ndị igbo nwere n’oge ochie nakwa n’oge ugbu a banyere ndụ nakwa ụwa ha nọ n’ime ya. Ụfọdụ ihe ndị ahụ gụnyere: Ịgụ oge, nkwenye na ihe ndị mere mmadụ