NNWEMAGBA ASỤSỤ NYE ECHICHE NA NSIRIHỤ ASỤSỤ IGBO

Authors

  • Patrick Umezi Author

Keywords:

Nchọcha, nnwemagba, asụsụ, Igbo

Abstract

Nchọcha a bụ maka nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta etu asụsụ si nwe agba nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo. Ọ gbasoro atụtụ Sapir na Whorf (1948) wee nye nkọwa ya. Ka e mechara nchọcha a, a chọpụtara na nnwemagba asụsụ nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo pụtara ihe n’ebe ndị a: etu ndị Igbo si agụ ihe aha; Etu ha si agụ ihe ọkpụ aha dị iche na etu ha si agụ ihe mbịa mbịa aha, site n’ihe nhụrụnuche dị iche iche, okwu mbite, site n’imepụta ihe ọkpụ dị iche iche, na kwa site na nsịnakwụkwọnsọ. Ihe ndị a gosiri na asụsụ nwere agba nye echiche na nsirihụ asụsụ Igbo.

Downloads

Published

2017-09-23

Issue

Section

Articles