IJI ADỊMIKE ASỤSỤ IGBO ZORO EZO RỤPỤTA ỌRỤ
Keywords:
Adịmike, asụsụ, zoro ezo, rụpụta, ọrụAbstract
Asụsụ bụ ihe dị ndụ, dị omimi, ma na-anwụkwa anwụ. N'ime ọtụtụ asụsụ e nwere n'ụwa, naanị ole na ole ka e ji arụpụta ihe a na-ahụ anya. Nke a apụtaghị na o nwere asụsụ ka ibe ya mma, kama, ọ na-egosi na asụsụ ndị ahụ etoruela ogo iji ha na-egbo mkpa. Edemede a gbadoro ụkwụ n'ịchọpụta adịmike asụsụ Igbo ndị zoro ezo na ịkwalite ha ruo ogugo iji ha na-egbo mkpa dị iche iche na ndụ mmadụ. Ngwa ọrụ e jiri mee nchọcha a bụ ilu Igbo ise. Site na nkọwa na ntụcha ilu ise ndị a tụlere na nchọcha a, a chọpụtara na asụsụ Igbo nwere adimike miri emi zoro ezo nke naanị ndị Igbo ga-achọpụta ma kwalite maka igbo mkpa dị iche iche.