OSISI ỤFỌDỤ NDỊ E NWERE N’ALA IGBO NA MPỤTARA AHA HA
Keywords:
Osisi, Ala Igbo, Mkpụta, AhaAbstract
Nchọcha a bụ maka osisi ụfọdụ ndị e nwere n’ala Igbo na mkpụtara aha ha. Aha bụ ihe e ji mara ihe kpọmkwem nke na o nweghị onye ya na ihe ahụ ga-azọ ya azo, ebe osisi bụ otu n’ime ihe Chineke kere nye mmadụ iji mee ka ndụ too uto ma na-aga nke ọma. Osisi ụfọdụ e nwere n’ala Igbo nwekwara mkpụtara ha n’ụzọ dị iche iche. Ihe kpalitere mmụọ ọrụ nchọcha bụ ime ka ndị mmadụ mata na ụfọdụ n’ime osisi e nwere n’ala Igbo nwere mkpụtara site n’aha ha na-aza. Ọzọkwa, ụfọdụ osisi ndị ahụ na-ezipụta akparamàgwà ha na ọdịdị ha na etu ha si dị n’ọnụ ma ọ bụ n’anya. O nweghị nchọcha e mereela maka isiokwu a n’asụsụ Igbo otu o kwesịrị iji chọpụta mkpụtara aha osisi ndị ahụ. Nwa nchọcha gbasoro usoro nkọwasị n’ime nchọcha a. Ihe nwa nchọcha bu n’obi bụ ịchọpụta ụfọdụ aha osisi ndị ahụ e nwere. Osisi ụfọdụ e nwere na-akpa agwa dị ka mkpụtara aha ha siri dị. Atụmatụ mgbakwasa okwu nchọcha a bụ atụmatụ njirieme na atụmatụ nrugara aka. A chọpụtara na ụfọdụ n’ime osisi ndị a bụ osisi dị na gburugburu ebe ndị mmadụ bi gasị, ma ha amaghi mkpụtara ha, ebe ụfọdụ n’ime ha bụkwa ndị dị n’ime oke ọhịa dị ka: Anụnụebe nke mkpụtara ya bụ “nnụnụ ebe ebe”, Osigburummụọ, nke a gosiri na osisi a na-esi ajọ isi nke e kwesịghị idobe n’ebe mmadụ bi, wdg. A chọpụtara na osisi ụfọdụ ndị a nwere ugwu na nsọpụrụ pụrụ iche n’ala Igbo karịa ibe ha. Ebe nwa nchọcha siri wepụta ngwa nchọcha ya bụ n’akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche yana ajụjụ ọnụ ọ gbara ndị maara ihe ekwe na-akụ n’ebe osisi dị n’ala Igbo. Aro nchọcha a bụ ka ndị mmadụ nwee ike iji ụbụrụ ha na-arụọ ọrụ oge ọbụla site n’ichemi echiche ime gbasara ụfọdụ ihe ha na-ahụ gasị na gbara-gburugburu ha. Nchọcha a ga-abakwa na nchịkọta site n’ime ka ndị mmadụ gaa n’ihu ime nchọcha n’ihe ụfọdụ dị ka akụkụ ahụ mmadụ na mkpụtara aha ha ma ọ bụ mkpụrụ aha anụmanụ ụfọdụ e nwere n’ala Igbo.