AGWARA NJIKỌ AKỤKỤ AHỤ NA NGWAA N’IGBO
Keywords:
Akụkụ ahụ mmadụ, ngwaa, asụsụ IgboAbstract
Akụkụ ahụ mmadụ bụ ihe ndị na-egosi onwe ha n’elu ahụ mmadụ nakwa n’ime ahụ mmadụ dị ka ọdịdị chi onye ahụ siri dị. Akụkụ ahụ dị nnukwu mkpa n’ndụ mmadụ. Ọ bụ mpaghara dị iche iche dị n’ahụ mmadụ, nke e ji emepụta ihe ma ọ bụ gboo mkpa. Ya na ngwaa na-agakọrịta n’asụsụ Igbo. Ngwaa n’onwe ya bụ nkeji asụsụ na-ezipụta mmegharị isi ahịrị n’ahịrịokwu. Ọ bụkwa ngwaa na-ezipụta omume ma ọ bụ ọdịdị ihe a na-ekwu maka ya n’ahịrịokwu. Ebumnuche nchọcha a bụ ịchọpụta akụkụ ahụ mmadụ dị iche iche na ngwaa ha hụrụ ọnụ, iji mata ihe jikọrọ ha na ihe kpatara ha ji agakọrịta n’asụsụ Igbo. Nchọcha a na-achọkwa ịmata ihe ọrụ akụkụ ahụ mmadụ na-eme na ihe a na-eme akụkụ ahụ mmadụ. Ọ bụ ebumnuche abụọ a kpaliri mmụọ nwa nchọcha ịbagide nchọcha a n’isiokwu a bụ “Agwara Njikọ Akụkụ Ahụ Mmadụ na Ngwaa n’Igbo.” Usoro nwa nchọcha ji mee nchọcha a bụ usoro nkọwa. Atụmatụ na-agbazi ụzọ e si eme nchọcha a bụ Atụmatụ Mkpụrụ Echiche Ndịnokwu (Theory of Componential Analysis). Nchọpụta nchọcha a na-egosi na akụkụ ahụ ọ bụla nwere mkpụrụ echichi ga-adịrịrị na ya tupu a kpọọ ya. Nchọpụta ọzọ na-egosi na ọ bụ mkpụrụ echichi ndị a mejupụtara echiche akụkụ ahụ mmadụ. Ụzọ a ka o si emetụta akụrụngwa ngwaa. A chọpụtakwara na tupu ngwaa na akụkụ ahụ mmadụ agakọrịta, ha ga-enwekọrịrị ntakịrị ma ọ bụ ọtụtụ mkpụrụ echichi. Akụkụ ahụ mmadụ na ngwaa na-agakọrịta oge ha nwere agwara ọnụ. Nchọcha a ga-abara ndị odee, ụmụakwụkwọ, ndị ọkà asụsụ na ndị nkuzi na-akụzi Igbo uru. Ọ ga-abakwara asụsụ Igbo uru.