“Isi Akwụ Dara n’Ala” Dịka Ilu Zipụtara Ịgba Alụkwaghịm n’Iduuazị Tony Ubesie
Keywords:
Ilu, Iduuazị, Atụtụ Max, Ịgba Alụkwaghịm, Agụmagụ, AlumdiAbstract
Ilu so n’otu n’ime atụmatụ agụmagụ e nwere ndị odee ji achọ agụmagụ ha mma. Ụfọdụ Nchọcha a bụ banyere ịgba alụkwaghịm na ịchọpụta etu Ubesie siri were ilu wee zipụta omenala a n’ime iduuazị ya a họọrọ maka nchọcha a. E nweela ọtụtụ nchọcha e merela n’oge gara aga banyere iduuazị nke Ubesie n’isiokwu dị iche iche mana e nwebeghị nke e mere banyere izipụta aha akwụkwọ ya dịka Ilu e jiri zipụta omenala ịgba alụkwaghịm. Nchọcha a bụ ụdị nchọcha nkọwa nke a gbasoro atụtụ Max wee nyochaa. Ebe mgbado ụkwụ nchọcha a bụ n’iduuazị Isi Akwụ Dara n’Ala nke Tony Ubesie dere. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta ịgba alụkwaghịm dịka omenala Igbo, na ịmata etu Ubesie siri zipụta aha akwụkwọ iduuazị ya a họọrọ bụ ilu, iji gosi ịgba alụkwaghịm. A chọpụtara na Ubesie ji akparamaagwa o zipụtara n’ime iduuazị ya wee gbaa ịgba alụkwaghịm n’anwụ. Ọzọ, a chọpụtara na ịgba alụkwaghịm abụchaghị ihe ọjọọ kama ọ bụ nnwereonwe, site n’etu Ubesie siri zipụta ya n’iduuazị ya. Nchọcha a ga-enye aka n’ịkwalite agụmagụ ederede na omenala Igbo ma nyekwa aka ime ka ndị ọzọ chọrọ ime nchọcha n’ụdị isiokwu a gbalịa ịchọpụta mpụtara aha akwụkwọ agụmagụ ndị odee ndị ọzọ na ihe ha nọchịrị anya ha.