Agụmagụ nke dị ka ebe nyocha agụmagụ edere nleba anya n’agụmagụ a karịrị na ngene na nwaata rie awụ.
Abstract
Agụmagụ ọnụ ebe nyocha agụmagụ edereede na-akọwa na agụmagụ edereede nwere ebe ha gbadoro ụkwụ wee malite; ha anọkataghị bido. Ndị Igbo na-eche na agụmagụ Igbo pụtara ihe na nleba anya afọ 1935, ha amaghị n’agụmagụ ọnụ/ọdinaala dịrị, kama enweghi ebe ebipụtara ha n’ihi na ewezuga agụmagụ ọnụ/ọdinaala, agụmagụ edereede agaghị enwe mgbọrọgwụ zuru oke. Na nchọcha e mere, a chọpụtara n’akwụkwọ mbụ ndị Igbo dere oge ndị ọcha oziọma nọ n’afọ 1930 ruo 1961, mgbe ndọrọndọrọ ọtọgrafi biri, nwere ụfọdụ ihe a na-ahụ n’agụmagụ ọnụ/ọdinaala nke pụtara ihe na ya. E wepụ Ọmenụkọ e dere n’afọ 1935, akụkọ ndị ọzọ gbadoro ụkwụ n’akụkọ ifo dị ka Ala Bingo, Elelia, na Ihe Ọ Mere. Ndị odee agụmagụ Igbo malitere iwebata ụfọdụ ihe dị n’agụmagụ ọnụ/ọdinaala dị ka akparamaagwa ifo, omenala, nkwenye, obibindu, ejiji, na emume ndị Igbo n’agụmagụ edereede ha. Ihe ndị a niile bụ ihe dịbu n’agụmagụ ọnụ. Ihe a niile mere nchọcha ji gbadoro ụkwụ n’agụmagụ odee ndị a họọrọ iji zipụta ka ndị odee agụmagụ Igbo si ezipụta agụmagụ ọnụ n’edereede ha. Nchọcha chọpụtara na e wepusịa ihe ndị a niile n’agụmagụ edereede Igbo, ọ gaghị ezu oke iji mee ka agụmagụ Igbo pụta ìhè, n’agbanyeghị na ọtụtụ odee ji asụsụ Bekee were ezipụta obibindu na ihe gbasara ndị Igbo n’agụmagụ ha. A gbasoro usoro nkọwa wee mee ka ọha na eze mata na agaghị ewezuganwu agụmagụ ọnụ/ọdinaala n’ime agụmagụ edereede n’ihi na ọ bụ mmewere ya. Ọzọ bụ ka ndị odee ọhụụ kpara ahụ na-agbaso usoro a.