NKWAGHA DỊ KA O SI METỤTA ASỤSỤ NA NZIKỌRỊTA OZI
Keywords:
Nkwagha, Ntorobịa, Asụsụ Na Nzikọrịta OziAbstract
Nkwagha pụtara mmadụ isi ebe ọ bi kwafee ebe ọzọ. Nkwagha na-eweta mgbanwe n'asụsụ ma na-ebute nsogbu dị iche iche mgbe ndị mmadụ agaghị enwenwu ike inwe nzikorịta ozi nke ọma maka ndịiche dị n’asụsụ. Ụfọdụ ebumnuche nchọcha a bụ ileba anya n’ihe bụ nkwagha na ụdị ya dị iche iche, nkwagha ndị ntotobịa na ụdị nkwagha ha na-eme n’oge ugbua, ihe butere ya na ịgba n’anwụ ka nkwagha si emetụta asụsụ na nzikọrịta ozi na ụzọ a ga-esi beleta ụdị nsogbu ndị a. Ngwa nchọcha a bụ ndị e wetara n'akwụkwọ agumagu, ntaneti, na ajụjụ ọnụ a gbara ụfọdụ ndị mmadụ. Nchọcha a bụ nke nkọwasị sovee. Atụtụ nchọcha a bụ nke inwe afọ ojuju onwe, ike asụsụ agbụrụ na atụtụ nkwagha nke Harris – Todaro. Nchọpụta ụfọdụ na-egosi na nkwagha na-eweta ọgbata uhie n’asụsụ na nzikọrita ozi, na-egbu asụsụ ma na-egbochi ihe ndi mmadụ nwere ike imenwu ma si na ha chọta ụzọ a ga-esi belata nsogbu ndị a. Nchọcha a ga-abara ọtụtụ ndị mmadụ na ndị gọọmenti uru. Ụfọdụ aro nchọcha a bụ ka ndị nne na nna ga na-azụnye ụmụ ha inwe nkwenye n’onwe ha site n’ijidesi asụsụ ha ike. Ọzọ ndị ọchịchị kwesiri ịrụpụta ụlọ dị iche iche, nye ndị ntorobịa ọrụ na ụfọdụ aro ndị ọzọ.