NKWAGHA DỊ KA O SI METỤTA ASỤSỤ NA NZIKỌRỊTA OZI

Authors

  • Florence Uju Ibeh; Onyinye Constance Amamgbo Author

Keywords:

Nkwagha, Ntorobịa, Asụsụ Na Nzikọrịta Ozi

Abstract

Nkwagha pụtara mmadụ isi ebe ọ bi kwafee ebe ọzọ. Nkwagha na-eweta mgbanwe n'asụsụ ma na-ebute nsogbu dị iche iche mgbe ndị mmadụ agaghị enwenwu ike inwe nzikorịta ozi nke ọma maka ndịiche dị n’asụsụ. Ụfọdụ ebumnuche nchọcha a bụ ileba anya n’ihe bụ nkwagha na ụdị ya dị iche iche, nkwagha ndị ntotobịa na ụdị nkwagha ha na-eme n’oge ugbua, ihe butere ya na ịgba n’anwụ ka nkwagha si emetụta asụsụ na nzikọrịta ozi na ụzọ a ga-esi beleta ụdị nsogbu ndị a. Ngwa nchọcha a bụ ndị e wetara n'akwụkwọ agumagu, ntaneti, na ajụjụ ọnụ a gbara ụfọdụ ndị mmadụ. Nchọcha a bụ nke nkọwasị sovee. Atụtụ nchọcha a bụ nke inwe afọ ojuju onwe, ike asụsụ agbụrụ na atụtụ nkwagha nke Harris – Todaro. Nchọpụta ụfọdụ na-egosi na nkwagha na-eweta ọgbata uhie n’asụsụ na nzikọrita ozi, na-egbu asụsụ ma na-egbochi ihe ndi mmadụ nwere ike imenwu ma si na ha chọta ụzọ a ga-esi belata nsogbu ndị a. Nchọcha a ga-abara ọtụtụ ndị mmadụ na ndị gọọmenti uru. Ụfọdụ aro nchọcha a bụ ka ndị nne na nna ga na-azụnye ụmụ ha inwe nkwenye n’onwe ha site n’ijidesi asụsụ ha ike. Ọzọ ndị ọchịchị kwesiri ịrụpụta ụlọ dị iche iche, nye ndị ntorobịa ọrụ na ụfọdụ aro ndị ọzọ.

Downloads

Published

2021-06-10