AGHA NWA NA-EBU N’ALA IGBO: MGBASI ỌLỤ SITERE N’AKWỤKWỌ ERIRI MARA NGWUGWU NA OBIDIYA

Authors

  • OLEKAIBE, CHINENYE C. Ph.D Author

Abstract

Igbo kwenyere na amụ nwa na-anọghị bụ amụ chọọ iche iche, kacha nke nwa nwoke. Nke a mere na onye Igbo ọ bụla na-agba mbọ hụ na nwa batara n’ime ezinụlọ ya site n’ụzọ ọ bụla o nwere ike. Oge ụfọdụ, ndị a edunyela ọtụtụ ụmụọfọ Igbo, ma ndị nwaanyị ma ndị nwoke, n’ime gbaghara. Ọ bụ ya kpaliri mmụọ odee o ji chọọ ka o mata ka ọnọdụ a si dị n’isiokwu a n’ime akwụkwọ Eriri mara ngwugwu na Obidiya. Nchọcha a chọpụtara na iji anya ọjọọ achọ nwa nwere ike itisa ezinụlọ ma wetakwa ndị nke a gbasara ihe ihere, dịka e si hụ ya n’ime akwụkwọ Eriri mara ngwugwu. Ọ chọpụtara na chọ nwa na-aka ụmụọnwaanyị njọ, gụnyere na ọnọdụ enweghi nwa na-edubakarị nwoke ịlụ nwaanyị ọzọ, ma dimkpa na-enweghi nwa nwoke nwere ike ime ka ụmụnna ya zọwa akụnụba ya ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. Otú o sina dị, e gosipụtara na di na nwunye nwekwara ike ibi n’udo ma hụkwa onwe ha n’anya na-agbanyeghị na ha amụtaghị nwa, dịka e si gosipụta ya n’ime akwụkwọ Obidiya.

Downloads

Published

2019-06-08