Anyaụkwụ: Ọnọdụ a hụrụ na ndụ ndị mmadụ dị ka e siri hụ ya n’Ejije ndị ọdịnala

Authors

  • Ayozie, Chioma R. Author

Abstract

Ndị Igbo kwenyere na ezi ndụ ka mma karịsịa ajọ ndụ n’ihi na ma ndụ ọma ma ndụ ọjọọ nwere ụgwọ na-eso ha. Ọ ka mma na mmadụ nwetara ezigbo ụgwọ ọrụ sitere na ndụ ọma karịsịa ntaramahụhụ sitere na ndụ ọjọọ. Na ndụ ndị Igbo na omenala ha, e nwere omume maọbụ agwa ọjọọ ndị ha na-ahụta dị ka ihe jọgburu udele na njọ. Ụfọdụ agwa ndị a gụnyere anyaukwu, igbu mmadụ, izu ohi, ntagbu mmadụ dgz. Nchọcha a gbakwasịrị ụkwụ n’anyaukwu dị ka otu n’ime agwa ọjọọ ndị Igbo na-agbarụrị ihu. Mbawanye anyaukwu bụ okwu a kpụ n’ọnụ n’ala Igbo taa. Nke a mere ka ebumnuche nchọcha a bụrụ ịchọpụta ihe na-akpata anyaukwu na ntaramahụhụ na-esi n’anyaukwu apụta, ụzọ a ga-esi ebelata anyaukwu, ụzọ dị iche iche ndị odee ejije Igbo a họọrọ siri zipụta anyaukwu na ntaramahụhụ so n’ejije ha, yana otu e si amata ntaramahụhụ ndị ahụ site n’ihe ndị mmadụ dere n’ejije Igbo. Ihe e ji mee nchọcha a bụ akwụkwọ ejije Igbo atọ ndị a họọrọ, nke gụnyere Obidiya nke Akọma (1977) dere, Ọkụ Ghara Ite (1988) nke Goddy Onyekọnwụ dere na Akwa Nwa (1979) nke Chukuezi dere. Atụtụ nchọcha a gbasoro bụ atụtụ ngụgụ iji nyochaa agụmagụ ndị a. Atụtụ a na-akọwa ka odee si webata nkwenye ọha ma jiri ya na-akwado omume agwa dị iche iche n’edemede ya. Usoro nchọcha a gbasoro bụ nchọcha nke sọvee. Site na nchọcha e mere, a chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị eche ntaramahụhụ na-eso agwa ọjọọ ụfọdụ ha na-akpa. N’ikpeazụ, onye nchọcha chịkọtara nchọcha ya site n’inye ndụmọdụ ka onye ọ bụla na-enwe afọ ojuju n’ihe ọ bụla o nwere. Ọ dịkwa mkpa ka nne na nna ruo ụmụ ha nso iji mata nsirihụ uwa ha na ụdị agwa ụmụ ha na-akpa. Nke a ga-enyere ha aka ịmata etu ha ga-esi dọọ ha ọdụ maọbụ gbanwee ha oge o kwesịrị.

Downloads

Published

2019-03-08