Mmọnwụ Ijele: Ọnọdụ ya n’etiti mmọnwụ a na-eti n’ala Igbo
Abstract
Edemede nchọcha a lebara anya na ọnọdụ mmọnwụ Ijele n’etiti mmọnwụ ndị ọzọ niile a na-eti n’ala Igbo. Ebumnuche e ji bagide edemede nchọcha a bụ ka e si na ya wee chetara ụmụafọ Igbo mkpa ọ dị na ha jigidesiri omenala etimmọnwụ ha aka ike. N’ụzọ pụrụ iche, ka e si na ya mee ka ọkwa mmọnwụ Ijele nọ na ndụ ndị Igbo pụta ìhè. Mmọnwụ Ijele nwere ọnọdụ dị elu na ndụ ndị Igbo, mana n’oge ugbu a, ụmụ Igbo na-elezi etimmọnwụ a anya ka ọ bụ arụrụala. Nke a mere na mmọnwụ Ijele na ugwu a na-akwanyere ya n’oge gboo na-alazi ala n’oge nke anyị a. Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji bagide edemede nchọcha a ka e wee si na ya zipụta na ọ bụ mmọnwụ Ijele kacha mmọnwụ niile a na-eti n’ala Igbo, ma si n’ụzọ dị otu a chekwaa ya. Ụdị nchọcha a bụ nke si n’ihe a hụrụ n’anya na n’ajụjụ ọnụ. Atụtụ e ji wee tụchaa edemede nchọcha a bụ Atụtụ Kenhazi, nke na-eleba anya na mmekọrịta a na-enwe n’obodo n’ogo dị iche iche na n’ọnọdụ dị iche iche. E mere nchọcha a n’agụmagụ ọdịnala ma bụrụ n’isiokwu na-ezipụta ọkwa mmọnwụ Ijele n’etiti mmọnwụ niile a na-eti n’ala Igbo. A gbara ajụjụ ọnụ, gaa n’ọbaakwụkwọ na ịntanetị wee chọta ntà ihe e dere n’edemede nchọcha a. A tụchara ụsa dị iche iche e si n’ụzọ ndị a nweta, nke e si na ha wee chọpụta na mmọnwụ Ijele bụ otu n’ime ọdịnala etimmọnwụ e ji mara ndị Igbo. Mmọnwụ Ijele si n’ọrụ nka na nkwenye na mmụọ wee pụta kacha mmọnwụ niile a na-eti n’ala Igbo. Edemede a ga-abara Ọhanaeze na onye ọ bụla nwere mmasi na mmọnwụ Ijele nakwa ọnọdụ ya na ndụ ndị Igbo uru.