Mmebemusoro Ahịrị Okwu Mkpatara n’Ezaa-Igbo

Authors

  • Emmanuel Emeka Nwaoke; Ifeoma Priscilla Asuzu & Gloria Chinonye Egesi Author

Abstract

Nchọcha a tụchara ahịrị okwu mkpatara n’olu Ẹzaa-Igbo ịkọwapụta mmebemusoro ha ọ kachasị etu o si metụta mkpụrụ okwu na mgbakwunye niile na-enye ụdị ahịrị okwu a echiche. A chọpụtara na ahịrị okwu mkpatara niile na-enwe nkebi ahịrị okwu abụọ: nkebi ahịrị nnọrọ onwe na nkebi ahịrị ndabe kenkwuwa mkpatara. Ọ na-enwekwa ngwaa mkpatara. Anaghị eji ngwaa enwennara ewube ahịrị okwu mkpatara kama ọ bụ ngwaa mmennara ndị na-aranye, aghọnye, edunye ma ọ bụ amanye mmadụ ime ihe ma site etu ahụ dọtara onwe ya nnara n’ahịrị okwu ka e ji ewube ahịrị okwu mkpatara. Ọ bụ nke a mere ngwaa mkpatara niile n’olu Ẹzaa ji bụrụ ngwaa mmennara. Ahịrị okwu mkpatara na-apụta ihe n’ụdị ahịrị okwu nrụmọrụ na/ma ọ bụ ahịrị okwu mmenannara. Ngwaa mkpatara ndị a na-ahụta n’ahịrị okwu ndị a na-akpa agwa ka ngwaa Ẹzaa-Igbo ndị ọzọ n’ahịrị nrụmọrụ nkwe mana n’ahịrị nrụmọrụ njụ, ngwaa ahụ na-adọtara onwe ya mgbakwunye ngarube njụ ta + isi ngwaa + dụ mana ọ bụrụ ahịrị mmenannara njụ, mgbakwunye ngarube njụ ya na-agbanwe pụta ihe n’ụdị Nganihu +Nganihu njụ +Isi ngwaa + Nsonazụ njụ. Ọ bụrụ na e mee nnara isi ụbụbọ n’ahịrị okwu mkpatara, be (ka) na-ejikọ ya na okwu ndị ọzọ dị na nkebi ahịrị nnọrọ onwe ahụ tupu nkebi ahịrị ndabe ya a na-esochi.

Downloads

Published

2023-12-25