Fonọlọjị Ọtọsegmentalụ na Ntụcha Ụdaolu n’Olu Ịka: Ụdachi na Ụdaahịrịokwu

Authors

  • Joy Oluchi Uguru Author

Abstract

Edemede a na-ekwu maka otu e si eji atụtụ ọtọsegmentị atụcha ụdaolu n’olu Ịka. Ọtụtụ mgbe, a naghị aghọtacha ka ụdaolu si arụ ọrụ n’ahịrịokwu; anyị ji edemede a kọwaa nke a. N’ịkọwa maka ụdaolu, ọ dị mkpa ikwu maka ụdachi nakwa ka ụdaolu si agbanwe n’ahịrịokwu. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n’olu Ịka. Anyị jiri fonọlọjị ọtọsegmentị wee gosi na mmekọrịta ụdaolu na ibe ya n’ahịrịokwu na-emetụta ụda ndokọelu n’olu Ịka; mkpụrụokwu anyị họtara n’Ịka (ode na-asụ Ịka) ka anyị ji kwara ngwa ọrụ. Edemede a na-egosi na iji atụtụ ọtọsegmentị kọwaa maka ụdaolu na-ekpughe nghọta zoro ezo n’ahịrịokwu. Ihe kpatara nke a bụ maka na ọtọsegmentị na-eme ka ọrụ ụdaolu pụta ìhè. Ntụcha ọtọsegmentị nyeere anyị aka igosi ka ụdaolu si agbanwe nakwa ihe kpatara ha ji efu n’ụfọdụ ahịrịokwu. Edemede a na- egosikwa na ọtọsegmentị na-akọwapụta ihe gbasara ụdaofeke nke ọma. Anyị tụkwara alo na ọ dị mkpa ịchọpụta otu a ga-esi na-eme ka ụdaofeke pụta ìhè ma a na-etinye akaraụdaolu n’edemede Igbo. Nke a bụ iji mee ka onye na-agụ Igbo nwee ike gụọ ya werewere.

Downloads

Published

2021-12-25